This poem is translated in English Language here and performed here.

(Egwu oka mgba na agba na mmeri)

Tie Igba!
Ka mgbaa egwu
Ukwum n’eteghari n’ije egwu gi
Mgbe obim na erita ndu n’egwu gi.

Abum nwa nwoke nnam
Onye mgba na amaghi echi ya
Enwudelum ujom na mgba
Ma mepekwaa anya isim.

Ka igba na ada!
Abughim onye ana emeri emeri
Odum na agbo uja n’oke ohia
Mana onaghi adogbu nwa ya.

Abum ike nke onwem
Anam eziga iwem n’obodo di anya
Dika amuma si n’igwe oji
Na egbe elu-igwe na agba be ndi ilo.

N’etilim igba!
Abum obi isi ike
Arum na amuta obi ike
Na achupukwa ujo.

Ndi na achu onyinyo efu
Ka chi ndi isi mmebi na achughari
Ujo na esiri ha nri
Ma na efichakwa mpako ha na enweghi.

Tie Igba!
Abum odiniru
Echi na enem anya n’iru
Na ezitakwa mmuta na anogide

Anyi n’eche nro anyi nche
Anyi na amunye nsogbu anyi oku
Na etinyekwa nkwenye anyi n’egwu gi
Nwannaa, tielum igba oganiru.

© Echezonachukwu Nduka

DON’T MISS OUT!
Subscribe To Newsletter
Be the first to get latest updates and exclusive content straight to your email inbox.
Stay Updated
Give it a try, you can unsubscribe anytime.

1 COMMENT

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here